1 Chronicles 24

Ndị nchụaja na ọrụ ha dị iche iche

1Ndị a bụ otu e si kenye ụmụ Erọn ọrụ ije ozi ha:

Ụmụ ndị ikom Erọn bụ Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.
2Ma Nadab na Abihu nwụrụ tupu nna ha anwụọ. Ha amụtaghị ụmụ ndị ikom, ya mere, Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja. 3Devid kewara ha dịka usoro ije ozi ha ga-esi dị. Ọ bụ Zadọk onye ikwu Elieza, na Ahimelek onye ikwu Itama nyeere Devid aka ime nke a. 4Ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Elieza karịrị ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Itama. Nʼihi ya, e sitere nʼikwu Elieza nweta ndịisi ezinaụlọ iri na isii, sitekwa nʼikwu Itama nweta ndịisi ezinaụlọ asatọ. 5E kere ha na-eleghị onye ọbụla anya nʼihu, site nʼife nza, nʼihi na e nwere ndịisi ozi ebe nsọ, nweekwa ndịisi ozi Chineke nʼetiti ndị ikwu Elieza na Itama.

6Ode akwụkwọ Shemaya, nwa Netanel, onye Livayị, dekọtara aha ndị a niile nʼihu eze, na ndịisi ozi eze, ya bụ, Zadọk onye nchụaja, na Ahimelek nwa Abịata, na ndịisi ezi ndị nchụaja, na nke ndị Livayị. E sitere nʼikwu Elieza, họrọ otu ezinaụlọ, sitekwa nʼikwu Itama họrọ otu ezinaụlọ.

7Nza nke mbụ mara Jehoiarib
nke abụọ a maa Jedaya
8nke atọ, Harim
nke anọ, Seorim
9nke ise, Malkija
nke isii, Mijamin
10nke asaa, Hakoz
nke asatọ, Abija
11nke itoolu, Jeshua
nke iri, Shekanaya
12nke iri na otu, Eliashib
nke iri na abụọ, Jakim
13nke iri na atọ, Hupa
nke iri na anọ, Jeshebeab
14nke iri na ise, Bilga
nke iri na isii, Imea
15nke iri na asaa, Hezia
nke iri na asatọ, Hapizez
16nke iri na itoolu, Petahaya
nke iri abụọ, Jehezkel
17nke iri abụọ na otu, Jakin
nke iri abụọ na abụọ, Gamul
18nke iri abụọ na atọ, Delaya
nke iri abụọ na anọ, Maazaya.

19Otu a ka e si keere ha usoro ije ozi ha mgbe ha batara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. E mere ya dị ka ụkpụrụ nna nna ha Erọn nyere ha si dị, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya nʼiwu.

Ndị ndu ọzọ e nwere nʼebo Livayị

20Ndị a bụkwa ndị ndu a họpụtara nʼebo Livayị:

Site nʼụmụ Amram, a họpụtara Shubuel.
Site nʼụmụ Shubuel a họpụtara Jehdeia.
21Site nʼụmụ Rehabaya, onye mbụ a họpụtara bụ Ishaya.
22Site na ndị Izha a họpụtara Shelomot.
Sitekwa nʼụmụ Shelomot a họpụtaara Jahat.
23Site nʼụmụ Hebrọn a họpụtara
Jeraya, nwa mbụ ya, Amaraya nwa nke abụọ ya, Jahaziel nwa nke atọ ya na Jekameam nwa nke anọ ya.
24A họpụtara Maịka nwa Uziel,
sitekwa nʼụmụ Maịka họpụta Shamia.
25A họpụtara nwanne Maịka nke nwoke aha ya bụ Ishaya,
sitekwa nʼụmụ Ishaya họpụta Zekaraya.
26Site nʼụmụ Merari e nwere Mahali na Mushi.
A họpụtakwara Beno nwa Jaazia.
27Sitekwa nʼụmụ Merari a họpụtara ụmụ Jaazia ndị a:
Beno, Shoham, Zakua na Ibri.
28Site nʼụmụ Mahali a họpụtara Elieza, ma Elieza nʼonwe ya amụtaghị nwa nwoke.
29Site nʼụmụ Kish a họpụtara Jerameel.
30Site nʼụmụ Mushi, a họpụtara Mahali, na Eda na Jerimot.

Ndị a niile bụ ndị Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị.

31Dịka e mere mgbe a na-ahọpụta ụmụ Erọn, e ji ife nza kenye ha niile ọrụ ha kwesiri ịrụ nʼotu nʼotu, onye ukwu ha na onye nta ha. E mere ya nʼihu eze Devid, na Zadọk, na Ahimelek, na ndịisi ezinaụlọ ndị nchụaja na ndị Livayị niile. Mgbe a na-efe nza a, e mesoro ndị ikom niile otu mmeso, ma okenye ha ma ndị na-etolite etolite.

Copyright information for IboBIU